Chekwubechukwu (Trust in God) Lyrics
- Genre:Gospel
- Year of Release:2022
Lyrics
Chukwu Nna, aga m abịa kelee Gị o!
Maka na agbanyeghị otu o siri dịrị mo!
Echekwubere m Gị, Chukwu Nna mo!
Echekwubere m Gi Chukwu!
Chekwube! Chekwube na Chukwu, (o-o-oh nwanne m!)
A mala jijiji, Chekwube Chukwu! (ngwa k'anyị jee!)
Chekwube Chukwu nwanne m! (nwanne m!) echegbuzila onwe gi o!
Chekwube Chukwu nwanne m! (O nwanne m!) biko echegbuzila onwe gi o!
N'ime ọnọdụ ọbụla, Chineke na-adị ndụ!
Ọ dị mma, ọ dị njọ Chineke nọ n'ọrụ!
Tụkwasị Chukwu obi, (adala mba) emesịa n'ọ ga-adị mma!
Wer'okwukwe na nchekwube jebe! chụnyere ya aja nchekwube gị, sị
"Chukwu Nna biko eguzo m n'ihu Gị o! ịchụnyere Gị aja nchekwube mo!
Biko doo doo!
Ebe ọ bụ Gị oke nkume mo! Ebe ọ bụ Gị ide ji ndụ mo!
Onye ka m ga-atụ egwu? Onye ga-eyi m egwu?
Papa biko biko ekwela ihere mee m, na Gị ka m chekwubere!
Ogụgụọmobi ekwela ihere mee m, na Gị ka m chekwubere"!
Ụmụ nnụnụ nke igwe, Onye na-elekọta ha?
Okooko osisi dị n'ọhịa, Onye na-achọ ha mma? (Chukwu!)
Ọ kwa Gị Chukwu maara mkpa mo!
Ọ kwa Ị gụrụ ntutuisi m ọnụ wee sị m gaba atụla ụjọ!
Aga m abịa butere Gị onyinye mo!
Maka na echekwubeere m Gị, Chukwu Nna mo!
Echekwubeere m Gị Chukwu! (O-o-oh! nwanne m!)
Ezi nwanne m, amala jijiji Chekwubechukwu! (ngwa k'anyị jee!)
Chekwube Chukwu nwanne m! (nwanne m!) echegbuzila onwe gi o!
Chekwube Chukwu nwanne m! (O nwanne m!) biko echegbuzila onwe gi o!
N'ime ọnọdụ ọbụla, Chineke na-adị ndụ!
Ọ dị mma, ọ dị njọ Chineke nọ n'ọrụ!
Tụkwasị Chukwu obi, (adala mba) emesịa n'ọ ga-adị mma!
Wer'okwukwe na nchekwube jebe! chụnyere ya aja nchekwube gị, sị
"Chukwu Nna biko eguzo m n'ihu Gị o! ịchụnyere Gị aja nchekwube mo!
Biko doo doo!
Ebe ọ bụ Gị (Oh!) Oke nkume mo! Ebe ọ bụ Gị (Oh!) Ide ji ndụ mo!
Onye ka m ga-atụ egwu? (Onye?) Onye ga-eyi m egwu?
Papa biko biko ekwela ihere mee m, na Gị ka m chekwubere!
Ogụgụọmobi ekwela ihere mee m, na Gị ka m chekwubere"!
Nna anyị Ebraham chunyeere Gị aja nchekwube
Nwaodibọ Gị Ebel chunyeere Gị aja nchekwube
Nwanyị Zarefat chunyeere Gị aja nchekwube
Nwanyị isimkpe chunyeere Gị aja nchekwube
Nwa Gị Jesu chunyeere Gị aja nchekwube, sị
Nna n'aka Gị ka m tinyere Mmụọ m!
Lezianu mo, asị m ka m bịa kelee Gị o!
Maka na e chekwubere m Gị Chukwu Nna mo!
Echekwubeere m Gị Chukwu! (O-o-oh! nwanne m!)
Ezi nwanne m, amala jijiji Chekwubechukwu! (ngwa k'anyị jee!)
Chekwube Chukwu nwanne m! (nwanne m!) echegbuzila onwe gi o!
Chekwube Chukwu nwanne m! (O nwanne m!) biko echegbuzila onwe gi o!
N'ime ọnọdụ ọbụla, Chineke na-adị ndụ!
Ọ dị mma, ọ dị njọ Chineke nọ n'ọrụ!
Tụkwasị Chukwu obi, (adala mba) emesịa n'ọ ga-adị mma!
Wer'okwukwe na nchekwube jebe! chụnyere Ya aja nchekwube gị, sị
"Chukwu Nna biko eguzo m n'ihu Gị o! ịchụnyere Gị aja nchekwube mo!
Biko doo doo!
Ebe ọ bụ Gị (Oh!) Oke nkume mo! Ebe ọ bụ Gị (Oh!) Ide ji ndụ mo!
Onye ka m ga-atụ egwu? (Onye?) Onye ga-eyi m egwu?
Papa biko biko ekwela ihere mee m, na Gị ka m chekwubere!
Ogụgụọmobi ekwela ihere mee m, na Gị ka m chekwubere"!
Ekele ka m jiri bịa (Echekwubere m na Gi o!)
Ukwe ka m jiri bịa (Echekwubere m na Gị o!)
Egwu ọyọrịma ka m jiri bịa o! (Echekwubere m na Gị o!)
Ikele Gị maka nke Ị mere eme! (Echekwubere m na Gị o!)
Ito Gị maka nke Ị ka ga-emekwa eme! (Echekwubere m na Gị o!)
Chukwu baara ebili mmiri mba! Onye gara ije n'elu mmiri!
Atụkwasara m Gị obi n'Ị bụ Chi mo! (Echekwubere m na Gị o!)
Maka na echekwubeere m Gị Chukwu Nna mo!