Ekwere m n'Otu Chineke II Lyrics
- Genre:Gospel
- Year of Release:2023
Lyrics
Ekwere m n'Otu Chineke
Nna ji ike niile
Onye mere eligwe na ala
Na ihe niile apụrụ ịhụ anya
Na ndị apụghị ịhụ anya
Ya na n'Otu Onyenweanyị, Jesu Kristi
Sọ otu Nwa Chineke mụrụ
Nna mụrụ tupu, tupu ụwatụwa niile
Chukwu si na Chukwu
Ihe si n'Ihe
Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu
Amụrụ amụ; emeghị eme
Ya na Nna bụ otu Ihe
N' Ọdịdị ebighịebi Ha jiri bụrụ Chukwu
Onye e si na Ya mee ihe dum
Onye, maka ihi anyị bụ mmadụ
Na maka ihi nzọpụta anyị
Siri n'eligwe gbadata
O WEERE AHU NA VEJIN MARIA
SITE NA MUỌ NSỌ, Ọ BURU MMADU
A kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị
N'oge ọchịchị Pọntius Paịlet
Ọ taa ahụhụ, nwụọ; e lie Ya
Ma O bilitere n'ụbọchi nke atọ
Ka Akwụkwọ Nsọ siri kwuo
Ọ rọgoro n'eligwe
Nọrọ n'akanri Nna
Ma Ọ ga-abịaghachi ọzọ n'ebube Ya
Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe
Onye ọchịchị Ya na-enweghị njedebe
Ekwere m na Mụo Nsọ
Dinwenu na Onye na-enye ndụ
Onye si na Nna na Nwa pụta
Onye a na-esekpuru
Na-etokọdo Ya na Nna na Nwa
Onye si na ndị amụma kwuo okwu
Ekwere m na Nzukọ
Nke dị otu, dị nsọ
Bụrụ Katọlik, na Apọstọlik
Ekwupụta m otu mmirichukwu
Maka mgbaghara njọ ga
Ana m atụ anya
Ana m atụ anya
Mbiliten'ọnwụ
Mbiliten'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ
Na ndụ ụwa ga-abịanụ
Amen! Amen!
Amen! Amen!
Amen! Amen!
Amen! Amen!