Bute Onyinye Obi Ocha Lyrics
- Genre:Afrobeats
- Year of Release:2018
Lyrics
Bute Onyinye Obi Ocha - Sir Jude Nnam
...
Bute onyinye obi ocha
(K′anyi nye Chukwu)
Bute onyinye mara mma
(O bu ya n'aso Chukwu)
Onyinye siri n′ezi obi gi puta
Mgbe obi gi di ocha
Buru ya bute onyinye n'iru Chineke
Ngozi Chukwu di n'udi n′udi
Onyinye ya abaka uba
Onwere ndi O nyere onyinye kaa aku n′uba
Nwe ndi O jiri onyinye omumu gozie
Uwa ezuoke nwanne o
Nke O nyere gi nara
Yoba nu ya, ma kwere
O ga-agozi kwa gi
Bute onyinye obi ocha
(K'anyi nye Chukwu)
Bute onyinye mara mma
(O bu ya n′aso Chukwu)
Onyinye siri n'ezi obi gi puta
Mgbe obi gi di ocha
Buru ya bute onyinye n′iru Chineke
Onye aririo no n'iru gi
I nyochaba akpa, choba obere ego
Okwa nke kacha obere!
I chezogo na Chukwu n′ele gi?
I sekpuru n'iru Chineke, wee rio ya aririo
Nwannem, O si otu ahu mee gi,
O g'adikwa gi mma?
Bute onyinye obi ocha
(K′anyi nye Chukwu)
Bute onyinye mara mma
(O bu ya n′aso Chukwu)
Onyinye siri n'ezi obi gi puta
Mgbe obi gi di ocha
Buru ya bute onyinye n′iru Chineke
I bu nkpa gi nile
Wee bia n'ulo nso Chukwu
Oge onyinye erugo
I nyochaba akpa, choba obere ego
O buru na Chineke, buru ngozi ya bata
Kee ya k′esi nye onyinye
O kwa, itaba onwe gi uta?
Bute onyinye obi ocha
(K'anyi nye Chukwu)
Bute onyinye mara mma
(O bu ya n′aso Chukwu)
Onyinye siri n'ezi obi gi puta
Mgbe obi gi di ocha
Buru ya bute onyinye n'iru Chineke
Buru ya bute onyinye n′iru Chineke
Buru ya bute onyinye n′iru Chineke